Hebrews 3

Jisọs dị ukwuu karịa Mosis

1Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị. 2O kwesiri ntụkwasị obi nye onye ahụ họpụtara ya dịka Mosis si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ya nʼụlọ Chineke. 3Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru. 4Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile. 5Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile, a sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu. 6Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.

Ịdọ aka na ntị banyere ekweghị ekwe

7Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị,

“Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa,
8unu emela ka obi unu sie ike,
dị ka unu mere nʼoge nnupu isi
mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara,
9ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa.
Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a.
10Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ.
Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile.
Ha amatabeghị ụzọ m niile.’
11Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị,
‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” b
12Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa. 13Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike. 14Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ. 15Dị ka e kwuru ya,

“Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya.
Unu emela ka obi unu sie ike,
dịka unu mere nʼoge nnupu isi.”
16Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt? 17Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara? 18Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi? 19Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.

Copyright information for IboBIU